Psalms 142

Abụ maskil nke Devid. Mgbe ọ nọ nʼọgba nkume. Ekpere.

Ekpere nke onye mkpọrọ

1Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa;
ewelitara m olu m rịọ Onyenwe anyị ka o meere m ebere.
2Ekwupụtara m ihe na-esogbu m nʼihu ya,
gwakwa ya ahụhụ nke m nọ nʼime ya.

3Mgbe mmụọ m dara mba nʼime m,
ọ bụ gị maara ụzọ m.
Nʼụzọ ebe m na-esi aga
ka ndị mmadụ siiri m ọnya.
4Lee anya nʼaka nri m ma hụ
na ọ dịghị onye ọbụla na-eche ihe banyere m.
Enweghị m ebe mgbaba.
Ọ dịghị onye ọbụla ihe banyere m na-emetụta nʼobi.

5Ana m etiku gị mkpu akwa, o Onyenwe anyị,
na-asị, “Gị bụ ebe mgbaba m,
oke m nʼala ndị dị ndụ.”

6Gee ntị na mkpu akwa m,
nʼihi na anọ m nʼọnọdụ ihe isiike;
gbapụta m site nʼaka ndị na-achụ m ọsọ,
nʼihi na ha siri ike karịa m.
7Mee ka m nwere onwe m site nʼụlọ mkpọrọ,
ka m nwee ike too aha gị.
Mgbe ahụ ndị ezi omume ga-agba m gburugburu
nʼihi ịdị mma gị nʼebe m nọ.
Copyright information for IboBIU